Isaiah 10:20 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na ndi Israel fọduru, ha na ndi ulo Jekob ndi bapuru ab͕apu, agaghi-adabere kwa ọzọ n'aru onye nētib͕u ha; kama ha gādabere Jehova, bú Onye Nsọ nke Israel, n'ezi-okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.