Isaiah 10:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ, maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.