Isaiah 13:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m ata ụwa ahụhụ nʼihi mmehie ya, taakwa ndị na-emebi iwu ahụhụ nʼihi mmehie ha. Ịnya isi nke onye mpako ka m ga-egwepịa, ya na nganga onye na-adịghị eme ebere.