Isaiah 14:19 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma gi onwe-gi, esiwo n'ílì-gi tupu gi dika alaka nke bu ihe-árú, yiri ndi eb͕uru eb͕u dika uwe, bú ndi ejiworo mma-agha dupú, ndi nāridaru nkume nke olùlù; dika ozu azọrọ ukwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ozu gị ka a tụpụrụ dịka alaka osisi rụrụ arụ, nke gbajiri agbaji. Ọ bụkwa ozu ndị niile e gburu nʼagha, na ozu ndị e ji mma agha mapuo afọ, ndị na-arịdaru nʼolulu nkume, ka e ji kpuchie gị nʼili gị. E, ozu gị dị ka ozu nke ịnyịnya zọtọrọ ụkwụ.