Isaiah 15:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ rigowo n'ulo, ọbuná Dibon, n'ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n'aru Nebo na n'aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n'isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.