Isaiah 17:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ubọchi ahu obodo-ya nile nke siri ike gādi ka ebe arapuru arapu nke oké ọhia na nke elu ugwu, nke ha rapuru n'iru umu Israel: ọ gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.