Isaiah 18:5 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi na tutu owuwe-ihe-ubi erue, mb͕e ifuru zusiri okè, na mb͕e okoko nāghọ nkpuru-vine nāchaghi acha, O gēji mma-nkwacha bipu umu-alaka-ya, ọ bu kwa alaka-ya nile ka Ọ gēwezuga b͕uchapu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị, mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata, ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya, ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.