Isaiah 22:11 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ebe-nchikọta-miri ka unu me-kwa-ra n'etiti mb͕idi-unu abua inagide miri nke ọdọ-miri ochie: ma unu elegideghi Onye nēme nka anya, ọ bu kwa Onye nākpu ya-ri site n'ebe di anya ka unu nēlekwasighi anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị Onye ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị Onye ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe.