Isaiah 22:25 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ubọchi ahu (ọ bu ihe si n'ọnu nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta) ka ǹtú nke akpọgideworo n'ebe kwesiri ntukwasi-obi gāpu n'ọnọdu-ya; ewe b͕utue ya, o we da, ewe bipu ibu di n'elu ya; n'ihi na Jehova ekwuwo ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na Onyenwe anyị ekwuola ya.