Isaiah 23:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.