Isaiah 23:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ka ihere me gi, Zaidon: n'ihi na oké osimiri ekwuwo, bú ebe siri ike nke oké osimiri, si, Ime emeghm, amuputakwaghm nwa, emekwaghm ka umu-okorọbia toputa, emekwaghm ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke tozue okè.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ka ihere mee gị, Saịdọn, na gị bụ ebe e wusiri ike nke osimiri, nʼihi na oke osimiri ekwuola okwu; “Ime emetụbeghị m, nke m ji amụpụta nwa; o nwebeghị mgbe m ji zụpụta ụmụ ndị ikom maọbụ ụmụ ndị inyom tozuru oke.”