Isaiah 24:23 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọnwa gēnwe kwa iru-ihere, ihere gēme kwa anyanwu; n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha aghọwo eze n'ugwu Zaion, na nime Jerusalem, ọ bu kwa n'iru ndi-okenye-Ya ka nsọpuru gādi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọnwa ga-ada mba, anwụ ka ihere ga-eme; nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achị nʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem, ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.