Isaiah 26:1 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ubọchi ahu ka agābù abù a n'ala Juda: Obodo siri ike ka ayi nwere; nzọputa ka O gēdo ka ọ buru mb͕idi-ya nile na ékpè-ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile: Anyị nwere obodo e wusiri ike. Chineke na-eme ka mgbidi ya na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị.