Isaiah 27:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n'ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala. Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri, ebe ha na-amakpu na-ezu ike. Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.