Isaiah 28:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Okwu Jehova gābu-kwa-ra ha ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu, ihe enyere n'iwu tukwasi ihe enyere n'iwu; usoro tukwasi usoro, usoro tukwasi usoro; nwantī ebe a, nwantī ebe ahu; ka ha we je, su ngọngọ da n'azu, ewe tijie ha, ha ama n'ọnyà, ejide ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.