Isaiah 28:27 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.