Isaiah 28:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
okoko-ọhia nke nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù, gādi kwa ka nkpuru-fig buru uzọ cha tutu mb͕e okpom-ọku erue; nke mb͕e onye ọ bula nke nāhu ya anya nāhu, mb͕e ọ nādi n'ọbu-aka-ya o lo ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya, nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe, ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo, nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka, tinye nʼọnụ ya, loo ha.