Isaiah 29:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-nwe-ayi we si, N'ihi na ndi nka abiaruwo nso n'ọnu-ha, were kwa eb͕ub͕ere-ọnu-ha sọpurum, ma ha emewo ka obi-ha di anya n'ebe M'nọ, egwu ha nāturum ewe buru ihe madu nyere n'iwu nke emere ka ha muta:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị sịrị, “Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso, ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ. Ofufe ha na-efe m, bụ nke gbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.