Isaiah 29:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ewe me ka i di ala, site n'ala ka i gēkwu, ọ bu kwa n'ájá ka okwu-ọnu-gi gēsi puta, di ala; olu-gi gādi kwa ka onye nāju mọ ihe, ọ gēsi n'ala puta, okwu-ọnu-gi gēsi kwa n'ájá be ka umu-nnunu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala, okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta. Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala, ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.