Isaiah 3:24 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ gēru kwa, na n'ọnọdu uda ọma ire-ure gādi; n'ọnọdu ihe ike n'úkwù udọ̀ gādi; n'ọnọdu agiri-isi akpara nke-ọma nkwọcha-isi gādi; n'ọnọdu ákwà ọma ihe-ọkiké nke ákwà-nkpe gādi: eb͕ub͕u-ọku gādi n'ọnọdu ima-nma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼọnọdụ ụda ọma, ha ga-esi ure ure; nʼọnọdụ ihe ike nʼukwu, ha ga-ekekwasị onwe ha eriri; nʼọnọdụ agịrị isi e doziri edozi, ha agaghị enwe ọ bụladị otu agịrị isi; nʼọnọdụ akwa ọcha, ọ bụ akwa mkpe ka ha ga-eyi; nʼọnọdụ ịma mma, anụ ahụ ha ga-achakpọsị.