Isaiah 32:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.