Isaiah 32:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na onye-nzuzu gēkwu ihe-nzuzu, obi-ya gēme kwa ajọ ihe, ime ihe emeruru emeru, na ikwu okwu njehie megide Jehova, ime ka nkpuru-obi nke onye agu nāgu b͕ara aka, na ime ka ihe-ọṅuṅu nke onye akpiri nakpọ nku kọ ukọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche, obi ha niile dị na-ime ajọ ihe. Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke, na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị; ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ.