Isaiah 34:14 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Anu-ọhia bi n'ala kpọrọ nku gēzute kwa anu-ọhia nēbe ebe, nkpi-ọhia gākpọ kwa ibe-ya; ọzọ, n'ebe ahu ka lilith gānọdu, chọtara onwe-ya ebe-izu-ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anụ ọhịa niile nke ọzara ga-ezute nkịta ọhịa nʼebe ahụ. Ụmụ mkpi ọhịa ga-awagharị nʼebe ahụ na-ebeku ibe ha akwa. Nʼebe ahụ ka ụmụ anụ ọhịa na-akpagharị nʼabalị ga-ezo onwe ha, chọtakwara onwe ha ọnọdụ ebe izuike.