Isaiah 36:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Eze Asiria we si na Lekish ziga Rabshake rue Jerusalem jekuru Hezekaia, ya na oké usu-ndi-agha. O we guzo n'akuku uzọ-miri nke ọdọ-miri di n'elu, n'uzọ atuliri atuli nke ọhia ọsu-ákwà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, eze Asịrịa sitere na Lakish zipụ ọchịagha ya, ya na usuu ndị agha ijekwuru Hezekaya na Jerusalem. Mgbe ọchịagha ahụ kwụsịrị nʼụzọ mmiri nke ọdọ mmiri dị Elu, nʼụzọ jere nʼebe ọhịa Ọsụ akwa.