Isaiah 36:20 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Òle ndi n'etiti chi nile nke ala ndia ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'-akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Olee chi nʼime chi mba ndị a niile, bụ ndị zọpụtarala ala ha site nʼaka m? Unu si aṅaa chee na Onyenwe anyị pụrụ ịzọpụta Jerusalem site nʼaka m?”