Isaiah 37:38 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ na-akpọ isiala nʼụlọ chi ya a na-akpọ Nisrọk, ụmụ ya ndị ikom aha ha bụ Adramelek na Shareza were mma agha gbuo ya. Ha gbapụrụ ọsọ gbaga nʼala Ararat. Isahadon, bụ nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.