Isaiah 38:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Na mb͕e ahu Hezekaia riara ọria inwu anwu. Aisaia, bú onye-amuma, bú nwa Emoz, we biakute ya, si ya, Otú a ka Jehova siri, Nye ulo-gi iwu; n'ihi na onye nānwu anwu ka i bu, I gaghi-adi kwa ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”