Isaiah 40:21 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ùnu amaghi? ùnu anughi? ègosighi unu ya site na mb͕e mbu? ùnu aghọtaghi site na ntọ-ala nile nke uwa?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ na unu amaghị? Ọ ga-abụ na unu anụbeghị ya? Ọ pụtara na a kọbereghị unu ya site na mmalite? Ọ bụ na unu aghọtabeghị site na mgbe a tọrọ ntọala ụwa?