Isaiah 44:13 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye-ọ̀kà n'osisi nēseti eriri; ọ nēwere pencil kà ya; o were nkpu-ya nile akpucha ya, were kwa compass-ya kà ya, o we me ya ka ọ di ka ihe-atù nwoke, dika ima-nma nke madu, ibi n'ulo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisi were pensụlụ kaa ya; ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ, were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara. Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ, oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile, maka ibi nʼime ụlọ arụsị.