Isaiah 44:19 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ dighi kwa onye nēchetara obi-ya, ọ dighi kwa ihe-ọmuma maọbu nghọta di isi, Nkera-ya ka m'sureworo n'ọku; ọzọ kwa, esiwom achicha n'elu icheku-ọku-ya nēre ere; anamaru anu rie: #m'gēme kwa nke fọduru nime ya ka ọ ghọ ihe-árú? ọ̀ bu n'iru ogwe osisi ka m'gāda kpue iru n'ala?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche, ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị, “Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ, Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya, ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara. M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ? Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”