Isaiah 44:2 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Otú a ka Jehova siri, bú Onye kèworo gi, Onye kpuwo-kwa-ra gi site n'afọ nne-gi, Nke nēyere gi aka; Atula egwu, gi orùm, bú Jekob; na gi, Jeshurum, nke M'rọputara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu, bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ, na onye ga-enyere unu aka: Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.