Isaiah 44:26 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
abum Onye nēme ka okwu orù-Ya guzosie ike, Nke nēmezu kwa ndum-ọdu ndi-ozi-Ya; Onye ahu Nke nēkwu okwu bayere Jerusalem, si, Agēbi ya; Nke nēkwu kwa okwu bayere obodo nile nke Juda, si, Agēwu ha; nkpọnkpọ-ebe-ya nile ka M'gēwuli kwa:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuo meekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo, onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’ na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’ banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’