Isaiah 44:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Unu atula oké egwu, unu ama-kwa-la jijiji: ọ̀ bughi site na mb͕e gara aga ka M'meworo ka i nuru, gosi kwa gi ya? unu onwe-unu bu kwa ndi-àmàm. Ọ̀ di Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem? é-è, ọ dighi Oké Nkume ọ bula di; ọ dighi otù efu M'mara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji. Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga. Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m? Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”