Isaiah 46:4 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya, ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu. Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu. Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.