Isaiah 48:16 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Biakutenum nso, nurunu nka; site na mb͕e mbu ọ bughi na nzuzo ka M'kwuworo okwu; site na mb͕e ọdidi-ya, n'ebe ahu ka M'nọ: ma ub͕u a Onye-nwe-ayi Jehova ezitewom, mu na Mọ-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Bịakwutenụ m nso, geenụ ntị na nke a: “Site na mkpọsa mbụ ọ bụghị na nzuzo ka m kwuru okwu; mgbe o mere anọ m nʼebe ahụ.” Ma ugbu a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ezitela m, o mejupụtala m na Mmụọ ya.