Isaiah 49:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a Jehova siri, bú Onye kpuworom site n'afọ nnem iburu Ya orù, ime ka Jekob laghachikute Ya, ka ewe chikọta-kwa-ra Ya Israel: (anāsọpu-kwa-ram n'anya Jehova, Chinekem aghọwo ikem:)
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a Onyenwe anyị na-asị, Onye ahụ kpụrụ m nʼafọ nne m ka m bụrụ onye na-ejere ya ozi; ka ọ kpọghachite Jekọb nye ya ka achịkọtakwa ndị Izrel nyekwa ya onwe ya, nʼihi na-abụ m onye nsọpụrụ dịrị nʼanya Onyenwe anyị, Chineke m aghọkwaarala m ike m.