Isaiah 50:1 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Otú a ka Jehova siri, Òle ebe akwukwọ nkwa nke nne-unu di, bú nke M'ji chupu ya? ma-ọbu ònye nime ndi M'nara ego n'ọmuru-nwa ka M'reworo unu n'aka ya? Le, ọ bu n'ihi ajọ omume nile nke unu ka erere unu, ọ bu kwa n'ihi njehie nile nke unu ka achupuru nne-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka Onyenwe anyị sịrị, “Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dị bụ nke m ji chụpụ ya? Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọ ka m resiri unu? Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu; nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.