Isaiah 50:2 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Gini mere onye ọ bula adighi mb͕e M'biara? gini mere onye-ọziza adighi mb͕e M'kpọrọ òkù? ọ̀ bu na akam dikara nkpunkpu ma-ọli ib͕aputa? ma-ọbu ọ̀ dighi ike di nimem inaputa? Le, n'ibasi-nba-ikem anameme ka oké osimiri tasia, anameme osimiri ka ha ghọ ọzara: azù-ha nēsì ísì, n'ihi na miri adighi, we nwua n'akpiri-ikpọ-nku.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.