Isaiah 52:5 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ma ub͕u a, gini ka M'nwere ebe a, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na ewepuwo ndim n'efu? ndi nāchi ha nākwasi ákwá ike, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ọ bu kwa mb͕e nile n'ogologo ubọchi nile ka anēlelì aham.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara. “Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu, ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha na-ekwulukwa aha m ogologo ụbọchị niile.