Isaiah 54:17 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire. Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide. Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị. Mkpepụta ha na-esite na m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.