Isaiah 56:10 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Ndi-nche-ya bu ndi-ìsì, ha nile amaghi ama; ha nile bu nkita dara ob͕i, ha apughi ib͕ọ uja; ha bu ndi nārọ nrọ, nēdina ala, nāhu itu-òrù-ura n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ndị na-eche ndị m nche kpuru ìsì. Ha niile bụ ndị amamihe kọrọ. Ha dị ka nkịta dara ogbi, nke na-adịghị agbọ ụja. Ha hụrụ ịrahụ ụra na ịrọ nrọ, na idina ndina nʼanya.