Isaiah 57:6 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n'ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chi unu na-efe bụ nkume niile na-akwọ mụrụmụrụ, nke dị na ndagwurugwu niile, ha bụ ihe nketa nza unu fere. E, ọ bụ ha ka unu na-awụpụrụ onyinye mmanya unu niile na onyinye mkpụrụ ọka unu niile. Nʼihi ihe ndị a niile, m ga-esi aṅaa dere duu?