Isaiah 59:12 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
N'ihi na njehie-ayi bara uba n'iru Gi, nmehie nile nke ayi azawo kwa megide ayi: n'ihi na ayi na njehie nile ayi nọkọ n'otù; ọzọ, ajọ omume nile ayi, ayi mara ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu Onyenwe anyị; ọ na-agbakwa ama megide anyị. E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ, nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile.