Isaiah 59:9 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
N'ihi ya ikpé nke ziri ezi adiwo anya n'ebe ayi nọ, ezi omume adighi-eru kwa ayi aru: ayi nēle anya ìhè, ma le, ọ bu ọchichiri; ayi nēle anya onwunwu-ọku, ma ọ bu n'oké ọchichiri ka ayi nējeghari.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị.