Isaiah 65:25 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe, ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi, ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja! Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ, maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.” Ka Onyenwe anyị kwuru.