Isaiah 66:3 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Onye nēb͕u ehi di ka onye nētib͕u madu; onye ji nwa-aturu achu àjà di ka onye nāb͕aji olu nkita; onye nēsure àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma, di ka onye nēsure ọbara ezì; onye nēsure frankincense ka ọ buru ihe-ncheta di ka onye nāgọzi ajọ ihe: e, ndi ahu arọputawo uzọ nile nke aka ha, ọ bu kwa ihe-árú nile ha nātọ nkpuru-obi-ha utọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehi dịka nwoke na-egbu mmadụ, onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ aja dị ka onye na-agbaji nkịta olu, onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọka dị ka onye na-eche ọbara ezi, otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke ncheta dị ka onye na-efe arụsị. Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha, ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.