Isaiah 66:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Mu onwem gārọputa kwa ichì-ọchì nile ha, me kwa ka ihe-ujọ nile ha biakwasi ha; n'ihi na M'kpọrọ òkù, ma ọ dighi onye nāza; ekwurum okwu, ma ha anugh: ha we me ihe jọrọ njọ n'anyam, ọ bu kwa ihe ahu nke nātọghm utọ ka ha rọputara.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu, mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha. Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị, mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị. Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m, họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”