Isaiah 7:4 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
si ya, Lezie anya, nọ kwa jū; atula egwu, ka obi-gi ghara kwa itu ujọ, site n'ọdudù abua ndia nke ọlọkọ-ọku nākwu anwuru-ọku, n'ihi iwe di ọku nke Rezin na Siria, na nke nwa Remalaia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gwa ya ka ọ ghara inye ndụ ya nsogbu, ka ọ gharakwa ịtụ egwu. Sị ya, ‘Lezie anya, nọ jụụ, echegbula onwe ya banyere icheku ọkụ abụọ ahụ na-anyụ anyụ. Atụla egwu nʼihi iwe Rezin nwa Aram, na iwe Peka nwa Remalaya.