Isaiah 9:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.