Isaiah 9:3 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
I mewo ka mba ahu ba uba, I mewo ka ọṅù diri ya uku: ha aṅuriwo n'iru Gi dika ọṅù nke di n'owuwe-ihe-ubi, dika madu si eteghari egwú ọṅù mb͕e ha nēkasa ihe akwatara n'agha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.